Job 5:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ ya na-enye elu ụwa mmiri ozuzo, ma na-ezigakwa mmiri nʼubi niile.
Job 5:10 in English
Job 5:10 · Berean Standard Bible
He gives rain to the earth and sends water upon the fields.
Context
8“Ma ọ bụrụ na m bụ gị, m ga-ekpesara Chineke;
ya ka m ga-akọsara ihe niile. 9Nʼihi na Chineke na-arụ ọrụ ịtụnanya karịrị nghọta,
ọrụ ebube nke a na-apụghị ịgụta ọnụ. 10Ọ bụ ya na-enye elu ụwa mmiri ozuzo,
ma na-ezigakwa mmiri nʼubi niile. 11Ọ na-ebuli ndị dị ala elu,
na-emekwa ka ndị na-eru ụjụ nọ nʼebe a na-echebe ha. 12Ọ na-emebi nzube niile nke ndị aghụghọ,
ka aka ha ghara imezu ihe ha zubere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.