Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-ekwenyere gị, na aka nri nwere ike ịzọpụta gị.

Job 40:14 in English

Job 40:14 · Berean Standard Bible

Then I will confess to you that your own right hand can save you.

Context

12lekwasịkwa ndị mpako niile anya mee ha ihe ihere, ma tiriekwa ndị na-emebi iwu ebe ha guzo. 13Likọta ha niile nʼotu nʼaja, kpuchie ihu ha niile nʼala ili. 14Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-ekwenyere gị, na aka nri nwere ike ịzọpụta gị. 15“Lee enyi mmiri anya, bụ nke m kere dịka m si kee gị, ma ihe ọ na-eri bụ ahịhịa dịka ehi. 16Lee ike dị nʼukwu ya, leekwa ike dị nʼime afọ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.