Job 40:15
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Lee enyi mmiri anya, bụ nke m kere dịka m si kee gị, ma ihe ọ na-eri bụ ahịhịa dịka ehi.
Job 40:15 in English
Job 40:15 · Berean Standard Bible
Look at Behemoth, which I made along with you. He feeds on grass like an ox.
Context
13Likọta ha niile nʼotu nʼaja,
kpuchie ihu ha niile nʼala ili. 14Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-ekwenyere gị,
na aka nri nwere ike ịzọpụta gị. 15“Lee enyi mmiri anya,
bụ nke m kere dịka m si kee gị,
ma ihe ọ na-eri bụ ahịhịa dịka ehi. 16Lee ike dị nʼukwu ya,
leekwa ike dị nʼime afọ ya. 17Ọdụdụ ya ka ọ na-efegharị dịka osisi sida;
akwara dị ya nʼahụ ka e jikọtara nke ọma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.