Job 39:9
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ị nwere ike ime ka atụ jeere gị ozi? Ị nwere ike ime ka ọ nọdụ nʼabalị nʼụlọ ebe ị na-azụ anụ ụlọ gị nri?
Job 39:9 in English
Job 39:9 · Berean Standard Bible
Will the wild ox consent to serve you? Will he stay by your manger at night?
Context
7Ụzụ dị nʼobodo adịghị emetụta ya,
ọ naghị anụkwa mbigbọ nke onye na-achị ya. 8Elu ugwu niile bụ ebe ịkpa nri ya,
ebe ahụ ka ọ na-achọpụta ahịhịa ndụ ọbụla. 9“Ị nwere ike ime ka atụ jeere gị ozi?
Ị nwere ike ime ka ọ nọdụ nʼabalị nʼụlọ ebe ị na-azụ anụ ụlọ gị nri? 10Ị nwere ike ime ka atụ rụọra gị ọrụ nʼubi gị?
Ọ ga-akpụgharịrị gị ọgụ ị ji akọ ala? 11Ị ga-atụkwasị ya obi nʼihi na ike ya hiri nne?
Ị ga-ahapụrụ ya ọrụ ndị ahụ siri ike ka ọ rụọ?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.