Job 39:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụzụ dị nʼobodo adịghị emetụta ya, ọ naghị anụkwa mbigbọ nke onye na-achị ya.
Job 39:7 in English
Job 39:7 · Berean Standard Bible
He scorns the tumult of the city and never hears the shouts of a driver.
Context
5“Onye na-eme ka ịnyịnya ibu ọhịa nwere onwe ya?
Onye na-atọpụ agbụ e kere ya? 6Nke m nyere ala ihe na-adịghị ka ọ bụrụ ebe obibi ha,
ala nnu ahụ ka ọ bụrụ ụlọ ha. 7Ụzụ dị nʼobodo adịghị emetụta ya,
ọ naghị anụkwa mbigbọ nke onye na-achị ya. 8Elu ugwu niile bụ ebe ịkpa nri ya,
ebe ahụ ka ọ na-achọpụta ahịhịa ndụ ọbụla. 9“Ị nwere ike ime ka atụ jeere gị ozi?
Ị nwere ike ime ka ọ nọdụ nʼabalị nʼụlọ ebe ị na-azụ anụ ụlọ gị nri?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.