Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị ga-atụkwasị ya obi nʼihi na ike ya hiri nne? Ị ga-ahapụrụ ya ọrụ ndị ahụ siri ike ka ọ rụọ?

Job 39:11 in English

Job 39:11 · Berean Standard Bible

Can you rely on his great strength? Will you leave your hard work to him?

Context

9“Ị nwere ike ime ka atụ jeere gị ozi? Ị nwere ike ime ka ọ nọdụ nʼabalị nʼụlọ ebe ị na-azụ anụ ụlọ gị nri? 10Ị nwere ike ime ka atụ rụọra gị ọrụ nʼubi gị? Ọ ga-akpụgharịrị gị ọgụ ị ji akọ ala? 11Ị ga-atụkwasị ya obi nʼihi na ike ya hiri nne? Ị ga-ahapụrụ ya ọrụ ndị ahụ siri ike ka ọ rụọ? 12I nwere ike ịtụkwasị ya obi ka o gaa bulatara gị ọka site nʼebe ịzọcha ọka gị? 13“Enyi nnụnụ na-eji ọṅụ gbasapụ nku ya, ma a pụghị iji nku ya tụnyere nku na abụba nke ụgbala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.