Job 39:25
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eti mkpu sị, ‘Ahaa!’ Site nʼebe dị anya ka ọ na-anụ isisi agha. Ọ na-aṅụrịkwa ọṅụ maka iti mkpu nke ndị ọchịagha nʼoge agha.
Job 39:25 in English
Job 39:25 · Berean Standard Bible
At the blast of the horn, he snorts with fervor.* He catches the scent of battle from afar— the shouts of captains and the cry of war.
Context
23Akpa àkụ na-ayọgharị nʼakụkụ ya,
ya na ùbe na arụa na-egbu maramara. 24Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eripịa ala.
Mgbe ọ nụrụ ụda opi ike, ọ naghị eguzo otu ebe. 25Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eti mkpu sị, ‘Ahaa!’
Site nʼebe dị anya ka ọ na-anụ isisi agha.
Ọ na-aṅụrịkwa ọṅụ maka iti mkpu nke ndị ọchịagha nʼoge agha. 26“Ọ bụ site nʼamamihe gị ka egbe ji efego nʼelu,
gbasaakwa nku ya gaa nʼebe ndịda? 27Ọ bụ gị nyere ugo iwu ifeli elu
ma wuo akwụ ya nʼebe dị elu?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.