Job 39:23
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Akpa àkụ na-ayọgharị nʼakụkụ ya, ya na ùbe na arụa na-egbu maramara.
Job 39:23 in English
Job 39:23 · Berean Standard Bible
A quiver rattles at his side, along with a flashing spear and lance.*
Context
21Ọ na-azọ ụkwụ gam gam nʼala, ọ na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ike ya,
ọ na-apụ izute agha na-atụghị egwu. 22Ọ na-achị ihe egwu ọchị, ụjọ ọbụla anaghị atụ ya;
ọ naghị esi na mma agha wezuga onwe ya. 23Akpa àkụ na-ayọgharị nʼakụkụ ya,
ya na ùbe na arụa na-egbu maramara. 24Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eripịa ala.
Mgbe ọ nụrụ ụda opi ike, ọ naghị eguzo otu ebe. 25Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eti mkpu sị, ‘Ahaa!’
Site nʼebe dị anya ka ọ na-anụ isisi agha.
Ọ na-aṅụrịkwa ọṅụ maka iti mkpu nke ndị ọchịagha nʼoge agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.