Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ na-achị ihe egwu ọchị, ụjọ ọbụla anaghị atụ ya; ọ naghị esi na mma agha wezuga onwe ya.

Job 39:22 in English

Job 39:22 · Berean Standard Bible

He laughs at fear, frightened of nothing; he does not turn back from the sword.

Context

20Ị na-eme ya ka ọ wụgharịa dịka igurube, were ebube* nke ịmapụ imi ya na-eyinye ihe oke egwu? 21Ọ na-azọ ụkwụ gam gam nʼala, ọ na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ike ya, ọ na-apụ izute agha na-atụghị egwu. 22Ọ na-achị ihe egwu ọchị, ụjọ ọbụla anaghị atụ ya; ọ naghị esi na mma agha wezuga onwe ya. 23Akpa àkụ na-ayọgharị nʼakụkụ ya, ya na ùbe na arụa na-egbu maramara. 24Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eripịa ala. Mgbe ọ nụrụ ụda opi ike, ọ naghị eguzo otu ebe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.