Job 38:3
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, jikere onwe gị dịka dimkpa nʼihi na enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị nke m chọrọ ka i nye m ọsịsa ha.
Job 38:3 in English
Job 38:3 · Berean Standard Bible
Now brace yourself * like a man; I will question you, and you shall inform Me.*
Context
1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị: 2“Onye bụ onye a nke ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya
na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ìhè? 3Ugbu a, jikere onwe gị dịka dimkpa
nʼihi na enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị
nke m chọrọ ka i nye m ọsịsa ha. 4“Ebee ka ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa?
Gwa m ma ọ bụrụ na ị ghọtara. 5Onye kpebiri ihe ụwa ga-aha ka ya? Nʼezie ị maara,
onye setịrị ihe ọtụtụ e ji tụọ ya nʼelu ya?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.