Job 38:5
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye kpebiri ihe ụwa ga-aha ka ya? Nʼezie ị maara, onye setịrị ihe ọtụtụ e ji tụọ ya nʼelu ya?
Job 38:5 in English
Job 38:5 · Berean Standard Bible
Who fixed its measurements? Surely you know! Or who stretched a measuring line across it?
Context
3Ugbu a, jikere onwe gị dịka dimkpa
nʼihi na enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị
nke m chọrọ ka i nye m ọsịsa ha. 4“Ebee ka ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa?
Gwa m ma ọ bụrụ na ị ghọtara. 5Onye kpebiri ihe ụwa ga-aha ka ya? Nʼezie ị maara,
onye setịrị ihe ọtụtụ e ji tụọ ya nʼelu ya? 6Nʼelu gịnị ka a tọrọ ntọala ya,
onye doro nkume mbụ e ji tọọ ntọala ya? 7Mgbe kpakpando nke isi ụtụtụ zukọrọ bụọ abụ,
ụmụ Chineke niile tisikwara mkpu ọṅụ ike?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.