Job 38:22
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ị banyela nʼụlọ niile ebe a na-achịkọba snoo, ka ị hụla ụlọ niile ebe a na-achịkọba mkpụrụ mmiri igwe,
Job 38:22 in English
Job 38:22 · Berean Standard Bible
Have you entered the storehouses of snow or observed the storehouses of hail,
Context
20Ị nwere ike iduru ha jee nʼebe ha bi?
Ị maara ụzọ e si eje ebe obibi ha? 21Nʼezie ị maara, nʼihi na a mụọla gị tupu e kee ihe ndị a!
Ị bikwaala ọtụtụ afọ. 22“Ị banyela nʼụlọ niile ebe a na-achịkọba snoo,
ka ị hụla ụlọ niile ebe a na-achịkọba mkpụrụ mmiri igwe, 23nke m chekwara nye oge nsogbu,
nʼoge ọgụ na nʼoge agha? 24Kedụ ụzọ e si ejeru ebe a na-anọ ekesasị amụma egbe eluigwe,
ebee ka e si ekesasị ifufe ọwụwa anyanwụ nʼelu ụwa?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.