Job 38:21
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼezie ị maara, nʼihi na a mụọla gị tupu e kee ihe ndị a! Ị bikwaala ọtụtụ afọ.
Job 38:21 in English
Job 38:21 · Berean Standard Bible
Surely you know, for you were already born! And the number of your days is great!
Context
19“Olee ụzọ e si aga ebe ìhè bi?
Olee ebe ọchịchịrị bi? 20Ị nwere ike iduru ha jee nʼebe ha bi?
Ị maara ụzọ e si eje ebe obibi ha? 21Nʼezie ị maara, nʼihi na a mụọla gị tupu e kee ihe ndị a!
Ị bikwaala ọtụtụ afọ. 22“Ị banyela nʼụlọ niile ebe a na-achịkọba snoo,
ka ị hụla ụlọ niile ebe a na-achịkọba mkpụrụ mmiri igwe, 23nke m chekwara nye oge nsogbu,
nʼoge ọgụ na nʼoge agha?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.