Job 34:20
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼotu ntabi anya, ha na-anwụ nʼime etiti abalị; ndị ahụ na-ama jijiji ma gabiga; a na-ewezugakwa ndị dị ike ma ọ bụghị site nʼaka mmadụ.
Job 34:20 in English
Job 34:20 · Berean Standard Bible
They die in an instant, in the middle of the night. The people convulse and pass away; the mighty are removed without human hand.
Context
18Ọ bụghị ya na-agwa ndị eze okwu sị, ‘Unu abaghị uru,’
ma na-agwakwa ndị a mara aha ha sị, ‘Unu bụ ndị ajọ omume.’ 19Onye na-adịghị ekpe ikpe mmegide* nye ụmụ ndị ikom eze,
onye na-adịghị emenyere ndị ọgaranya, ma megbuo ndị ogbenye,
nʼihi na ha niile bụ ọrụ aka ya. 20Nʼotu ntabi anya, ha na-anwụ nʼime etiti abalị;
ndị ahụ na-ama jijiji ma gabiga;
a na-ewezugakwa ndị dị ike ma ọ bụghị site nʼaka mmadụ. 21“Anya ya na-elekwasị ụzọ niile nke ụmụ mmadụ;
ọ na-ahụkwa nzọ ụkwụ ha niile. 22Ọ dịghị ọchịchịrị dị, ọ dịghịkwa oke ọchịchịrị dị,
ebe ndị na-eme ajọ ihe pụrụ izo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.