Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụghị ya na-agwa ndị eze okwu sị, ‘Unu abaghị uru,’ ma na-agwakwa ndị a mara aha ha sị, ‘Unu bụ ndị ajọ omume.’

Job 34:18 in English

Job 34:18 · Berean Standard Bible

who says to kings, ‘You are worthless!’ and to nobles, ‘You are wicked,’

Context

16“Ọ bụrụ na i nwere nghọta, nụrụ nke a; gee ntị nʼokwu m. 17Ọ pụrụ ịchị bụ onye ahụ kpọrọ ikpe ziri ezi asị? Ị ga-ama Onye ezi omume na onye dị ike ikpe? 18Ọ bụghị ya na-agwa ndị eze okwu sị, ‘Unu abaghị uru,’ ma na-agwakwa ndị a mara aha ha sị, ‘Unu bụ ndị ajọ omume.’ 19Onye na-adịghị ekpe ikpe mmegide* nye ụmụ ndị ikom eze, onye na-adịghị emenyere ndị ọgaranya, ma megbuo ndị ogbenye, nʼihi na ha niile bụ ọrụ aka ya. 20Nʼotu ntabi anya, ha na-anwụ nʼime etiti abalị; ndị ahụ na-ama jijiji ma gabiga; a na-ewezugakwa ndị dị ike ma ọ bụghị site nʼaka mmadụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.