Job 34:17
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ pụrụ ịchị bụ onye ahụ kpọrọ ikpe ziri ezi asị? Ị ga-ama Onye ezi omume na onye dị ike ikpe?
Job 34:17 in English
Job 34:17 · Berean Standard Bible
Could one who hates justice govern? Will you condemn the just and mighty One,
Context
15mmadụ niile ga-alakọta nʼiyi,
mmadụ niile ga-alaghachikwa nʼaja. 16“Ọ bụrụ na i nwere nghọta, nụrụ nke a;
gee ntị nʼokwu m. 17Ọ pụrụ ịchị bụ onye ahụ kpọrọ ikpe ziri ezi asị?
Ị ga-ama Onye ezi omume na onye dị ike ikpe? 18Ọ bụghị ya na-agwa ndị eze okwu sị, ‘Unu abaghị uru,’
ma na-agwakwa ndị a mara aha ha sị, ‘Unu bụ ndị ajọ omume.’ 19Onye na-adịghị ekpe ikpe mmegide* nye ụmụ ndị ikom eze,
onye na-adịghị emenyere ndị ọgaranya, ma megbuo ndị ogbenye,
nʼihi na ha niile bụ ọrụ aka ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.