Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ na-ekechi mmiri nʼime igwe ojii, ma ịdị arọ ya adịghị eme ka igwe ojii gbawaa.

Job 26:8 in English

Job 26:8 · Berean Standard Bible

He wraps up the waters in His clouds, yet the clouds do not burst under their own weight.

Context

6Ala mmụọ gba ọtọ nʼihu Chineke; mbibi* tọgbọkwara na-enweghị ihe kpuchiri ya. 7Ọ na-agbasapụ elu elu nke mbara eluigwe nʼelu ebe tọgbọrọ nʼefu. O nweghị ihe o kokwasịrị ụwa nʼelu ya. 8Ọ na-ekechi mmiri nʼime igwe ojii, ma ịdị arọ ya adịghị eme ka igwe ojii gbawaa. 9Ọ na-ekpuchi ihu ọnwa nke dị nʼuju ya,* na-agbasakwa igwe ojii ya nʼelu ya, 10O kewapụtara oke nʼelu ogbu mmiri, ka ọ bụrụ oke dị nʼetiti ìhè na ọchịchịrị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.