Jeremaya 9:20
Jeremiah 9:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ụmụ nwanyị, megheenụ ntị unu nụrụ okwu si ya nʼọnụ. Kuzierenụ ụmụ unu ndị inyom otu e si eti mkpu akwa, kuziekwaranụ ibe unu abụ akwa.
Jeremiah 9:20 in English
Jeremiah 9:20 · Berean Standard Bible
Now, O women, hear the word of the LORD. Open your ears to the word of His mouth. Teach your daughters to wail, and one another to lament.
Context
18Ha bịa ngwangwa
kwaa akwa nʼihi anyị,
tutu anya mmiri akwa ejupụta ha nʼanya,
tutu anya mmiri akwa esite anyị nʼanya na-asọda ruo na ntị anyị. 19Olu ụzụ ịkwa akwa ka a nụrụ site na Zayọn
‘Lee ka anyị si laa nʼiyi!
Lee ka ihe ihere anyị si dị ukwuu!
Nʼihi na anyị hapụrụ ala anyị,
nʼihi na ha etikpọsịala ebe obibi anyị niile.’ ” 20Ugbu a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ụmụ nwanyị,
megheenụ ntị unu nụrụ okwu si ya nʼọnụ.
Kuzierenụ ụmụ unu ndị inyom otu e si eti mkpu akwa,
kuziekwaranụ ibe unu abụ akwa. 21Nʼihi na ọnwụ abatala nʼetiti anyị, o si na oghereikuku niile nke ụlọ anyị
bata nʼebe niile e wusiri ike nke ala anyị.
O gbuola ụmụntakịrị ndị na-ejegharị nʼokporoụzọ,
gbukwaa ụmụ okorobịa ndị na-anọ nʼama. 22Gwa ha, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“ ‘Ozu ndị nwụrụ anwụ ga-atọgbọrọ
dịka unyi e kpofuru nʼọhịa,
dịka ukwu ọka nke e gbuturu nʼazụ onye na-aghọ mkpụrụ ubi,
nke ọ dịghị onye ga-achịkọta ha.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.