Jeremaya 9:18
Jeremiah 9:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha bịa ngwangwa kwaa akwa nʼihi anyị, tutu anya mmiri akwa ejupụta ha nʼanya, tutu anya mmiri akwa esite anyị nʼanya na-asọda ruo na ntị anyị.
Jeremiah 9:18 in English
Jeremiah 9:18 · Berean Standard Bible
Let them come quickly and take up a lament over us, that our eyes may overflow with tears, and our eyelids may gush with water.
Context
16Aga m ekposa ha na mba niile nke ụwa. Ha ga-ebi na mba nke ha na nna ha na-amaghị. Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ tutu ruo mgbe m bibiri ha niile.” 17Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Tụgharịanụ uche unu ugbu a. Kpọọnụ ụmụ nwanyị ndị ọrụ ha bụ ịbụ abụ akwa.
E, zienụ ozi ka ndị ọkachamara nʼetiti ha bịa. 18Ha bịa ngwangwa
kwaa akwa nʼihi anyị,
tutu anya mmiri akwa ejupụta ha nʼanya,
tutu anya mmiri akwa esite anyị nʼanya na-asọda ruo na ntị anyị. 19Olu ụzụ ịkwa akwa ka a nụrụ site na Zayọn
‘Lee ka anyị si laa nʼiyi!
Lee ka ihe ihere anyị si dị ukwuu!
Nʼihi na anyị hapụrụ ala anyị,
nʼihi na ha etikpọsịala ebe obibi anyị niile.’ ” 20Ugbu a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ụmụ nwanyị,
megheenụ ntị unu nụrụ okwu si ya nʼọnụ.
Kuzierenụ ụmụ unu ndị inyom otu e si eti mkpu akwa,
kuziekwaranụ ibe unu abụ akwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.