Jeremaya 9:17
Jeremiah 9:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Tụgharịanụ uche unu ugbu a. Kpọọnụ ụmụ nwanyị ndị ọrụ ha bụ ịbụ abụ akwa. E, zienụ ozi ka ndị ọkachamara nʼetiti ha bịa.
Jeremiah 9:17 in English
Jeremiah 9:17 · Berean Standard Bible
This is what the LORD of Hosts says: “Take note, and summon the wailing women; send for the most skillful among them.
Context
15Nʼihi ya, nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke Izrel kwuru, “Lee, aga m eme ka ndị a rie nri na-akụ ilu. Ha ga-aṅụkwa mmiri e tinyere nsi. 16Aga m ekposa ha na mba niile nke ụwa. Ha ga-ebi na mba nke ha na nna ha na-amaghị. Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ tutu ruo mgbe m bibiri ha niile.” 17Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Tụgharịanụ uche unu ugbu a. Kpọọnụ ụmụ nwanyị ndị ọrụ ha bụ ịbụ abụ akwa.
E, zienụ ozi ka ndị ọkachamara nʼetiti ha bịa. 18Ha bịa ngwangwa
kwaa akwa nʼihi anyị,
tutu anya mmiri akwa ejupụta ha nʼanya,
tutu anya mmiri akwa esite anyị nʼanya na-asọda ruo na ntị anyị. 19Olu ụzụ ịkwa akwa ka a nụrụ site na Zayọn
‘Lee ka anyị si laa nʼiyi!
Lee ka ihe ihere anyị si dị ukwuu!
Nʼihi na anyị hapụrụ ala anyị,
nʼihi na ha etikpọsịala ebe obibi anyị niile.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.