Jeremaya 9:21
Jeremiah 9:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ọnwụ abatala nʼetiti anyị, o si na oghereikuku niile nke ụlọ anyị bata nʼebe niile e wusiri ike nke ala anyị. O gbuola ụmụntakịrị ndị na-ejegharị nʼokporoụzọ, gbukwaa ụmụ okorobịa ndị na-anọ nʼama.
Jeremiah 9:21 in English
Jeremiah 9:21 · Berean Standard Bible
For death has climbed in through our windows; it has entered our fortresses to cut off the children from the streets, the young men from the town squares.
Context
19Olu ụzụ ịkwa akwa ka a nụrụ site na Zayọn
‘Lee ka anyị si laa nʼiyi!
Lee ka ihe ihere anyị si dị ukwuu!
Nʼihi na anyị hapụrụ ala anyị,
nʼihi na ha etikpọsịala ebe obibi anyị niile.’ ” 20Ugbu a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ụmụ nwanyị,
megheenụ ntị unu nụrụ okwu si ya nʼọnụ.
Kuzierenụ ụmụ unu ndị inyom otu e si eti mkpu akwa,
kuziekwaranụ ibe unu abụ akwa. 21Nʼihi na ọnwụ abatala nʼetiti anyị, o si na oghereikuku niile nke ụlọ anyị
bata nʼebe niile e wusiri ike nke ala anyị.
O gbuola ụmụntakịrị ndị na-ejegharị nʼokporoụzọ,
gbukwaa ụmụ okorobịa ndị na-anọ nʼama. 22Gwa ha, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“ ‘Ozu ndị nwụrụ anwụ ga-atọgbọrọ
dịka unyi e kpofuru nʼọhịa,
dịka ukwu ọka nke e gbuturu nʼazụ onye na-aghọ mkpụrụ ubi,
nke ọ dịghị onye ga-achịkọta ha.’ ” 23Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Ka onye maara ihe hapụ ịnya isi nʼihi amamihe ya,
ka onye dị ike ghara ịnya isi nʼihi ịdị ike ya,
ka ọgaranya hapụkwa ịnya isi nʼihi ịba ụba nke akụ ya,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.