Jeremaya 9:22
Jeremiah 9:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gwa ha, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “ ‘Ozu ndị nwụrụ anwụ ga-atọgbọrọ dịka unyi e kpofuru nʼọhịa, dịka ukwu ọka nke e gbuturu nʼazụ onye na-aghọ mkpụrụ ubi, nke ọ dịghị onye ga-achịkọta ha.’ ”
Jeremiah 9:22 in English
Jeremiah 9:22 · Berean Standard Bible
Declare that this is what the LORD says: “The corpses of men will fall like dung upon the open field, like newly cut grain behind the reaper, with no one to gather it.”
Context
20Ugbu a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ụmụ nwanyị,
megheenụ ntị unu nụrụ okwu si ya nʼọnụ.
Kuzierenụ ụmụ unu ndị inyom otu e si eti mkpu akwa,
kuziekwaranụ ibe unu abụ akwa. 21Nʼihi na ọnwụ abatala nʼetiti anyị, o si na oghereikuku niile nke ụlọ anyị
bata nʼebe niile e wusiri ike nke ala anyị.
O gbuola ụmụntakịrị ndị na-ejegharị nʼokporoụzọ,
gbukwaa ụmụ okorobịa ndị na-anọ nʼama. 22Gwa ha, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“ ‘Ozu ndị nwụrụ anwụ ga-atọgbọrọ
dịka unyi e kpofuru nʼọhịa,
dịka ukwu ọka nke e gbuturu nʼazụ onye na-aghọ mkpụrụ ubi,
nke ọ dịghị onye ga-achịkọta ha.’ ” 23Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Ka onye maara ihe hapụ ịnya isi nʼihi amamihe ya,
ka onye dị ike ghara ịnya isi nʼihi ịdị ike ya,
ka ọgaranya hapụkwa ịnya isi nʼihi ịba ụba nke akụ ya, 24kama, onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa isi nʼihi nke a:
na o nwere uche ịghọta na mụ onwe m bụ,
Onyenwe anyị nke na-eme obi ebere,
na-ekpe ikpe ziri ezi na ezi omume nʼụwa.
Nʼihi nʼihe ndị a ka m na-enwe obi ụtọ,”
ka Onyenwe anyị kwubiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.