Jeremaya 8:20
Jeremiah 8:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Oge owuwe ihe ubi agafeela, leekwa na ọkọchị agabigakwala, ma a zọpụtabeghị anyị.”
Jeremiah 8:20 in English
Jeremiah 8:20 · Berean Standard Bible
“The harvest has passed, the summer has ended, but we have not been saved.”
Context
18Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na m hụrụ onye ga-akasị m obi nʼime ọnọdụ iru ụjụ m,
nʼihi na obi m na-ada mba nʼime m.* 19Gee ntị nụrụ akwa ndị m
ka ọ na-ada site nʼebe dị anya.
“Onyenwe anyị, ọ sitela na Zayọn pụọ?
Ọ pụtara na Eze ha anọkwaghị nʼebe ahụ?”
“Gịnị mere ha ji site nʼoyiyi a tụrụ atụ,
na arụsị ndị mba ọzọ ha na-efe kpasuo m iwe?” 20“Oge owuwe ihe ubi agafeela,
leekwa na ọkọchị agabigakwala,
ma a zọpụtabeghị anyị.” 21Ebe ọ bụ na a zọpịara ndị m, ọ bụkwa m ka azọpịara.
Anam eru ụjụ, oke egwu jisikwara m aka ike. 22Ọ pụtara na o nweghị mmanụ otite na-eme ka ọnya laa dị na Gilead?
Ọ bụ na e nwekwaghị dibịa nọ nʼebe ahụ?
Gịnị mere o nweghị ọgwụgwọ dịrị ndị m
nʼihi mmerụ ahụ ha niile?
8:17 Ihe pụrụ ime na ha agaghị ata unu
8:18 Maọbụ, Unu ndị na-akasị m obi nʼime ọnọdụ iru ụjụ m, obi m na-ada mba nʼime m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.