Jeremaya 8:18
Jeremiah 8:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na m hụrụ onye ga-akasị m obi nʼime ọnọdụ iru ụjụ m, nʼihi na obi m na-ada mba nʼime m.*
Jeremiah 8:18 in English
Jeremiah 8:18 · Berean Standard Bible
My sorrow is beyond healing;* my heart is faint within me.
Context
16E sitere na Dan
nụ ụda ịma imi ịnyịnya ndị iro.
Ala a niile mara jijiji
mgbe ha nụrụ akwa nke ịnyịnya ndị ahụ dị ike.
Ha na-abịa ịla ala a na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi.
Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha
na-abịa ime obodo a na ndị bi nʼime ya. 17“Lee, ana m ezibata agwọ ọjọọ, ndị na-atagbu atagbu, nʼetiti unu.
Ajụala nke ọ dịkwaghị ụra ga-arata ha.*
Ana m ezibata ha ka ha taa unu.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 18Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na m hụrụ onye ga-akasị m obi nʼime ọnọdụ iru ụjụ m,
nʼihi na obi m na-ada mba nʼime m.* 19Gee ntị nụrụ akwa ndị m
ka ọ na-ada site nʼebe dị anya.
“Onyenwe anyị, ọ sitela na Zayọn pụọ?
Ọ pụtara na Eze ha anọkwaghị nʼebe ahụ?”
“Gịnị mere ha ji site nʼoyiyi a tụrụ atụ,
na arụsị ndị mba ọzọ ha na-efe kpasuo m iwe?” 20“Oge owuwe ihe ubi agafeela,
leekwa na ọkọchị agabigakwala,
ma a zọpụtabeghị anyị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.