Jeremaya 8:17
Jeremiah 8:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Lee, ana m ezibata agwọ ọjọọ, ndị na-atagbu atagbu, nʼetiti unu. Ajụala nke ọ dịkwaghị ụra ga-arata ha.* Ana m ezibata ha ka ha taa unu.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Jeremiah 8:17 in English
Jeremiah 8:17 · Berean Standard Bible
“For behold, I will send snakes among you, vipers that cannot be charmed, and they will bite you,” declares the LORD.
Context
15Anyị lere anya udo,
ma o nweghị ihe ọma ọbụla anyị hụrụ.
Anyị lere anya ọgwụgwọ ọrịa anyị,
maọbụ naanị ihe egwu ka anyị hụrụ. 16E sitere na Dan
nụ ụda ịma imi ịnyịnya ndị iro.
Ala a niile mara jijiji
mgbe ha nụrụ akwa nke ịnyịnya ndị ahụ dị ike.
Ha na-abịa ịla ala a na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi.
Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha
na-abịa ime obodo a na ndị bi nʼime ya. 17“Lee, ana m ezibata agwọ ọjọọ, ndị na-atagbu atagbu, nʼetiti unu.
Ajụala nke ọ dịkwaghị ụra ga-arata ha.*
Ana m ezibata ha ka ha taa unu.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 18Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na m hụrụ onye ga-akasị m obi nʼime ọnọdụ iru ụjụ m,
nʼihi na obi m na-ada mba nʼime m.* 19Gee ntị nụrụ akwa ndị m
ka ọ na-ada site nʼebe dị anya.
“Onyenwe anyị, ọ sitela na Zayọn pụọ?
Ọ pụtara na Eze ha anọkwaghị nʼebe ahụ?”
“Gịnị mere ha ji site nʼoyiyi a tụrụ atụ,
na arụsị ndị mba ọzọ ha na-efe kpasuo m iwe?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.