Jeremaya 8:16
Jeremiah 8:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E sitere na Dan nụ ụda ịma imi ịnyịnya ndị iro. Ala a niile mara jijiji mgbe ha nụrụ akwa nke ịnyịnya ndị ahụ dị ike. Ha na-abịa ịla ala a na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha na-abịa ime obodo a na ndị bi nʼime ya.
Jeremiah 8:16 in English
Jeremiah 8:16 · Berean Standard Bible
The snorting of enemy horses is heard from Dan. At the sound of the neighing of mighty steeds, the whole land quakes. They come to devour the land and everything in it, the city and all who dwell in it.
Context
14Gịnị ka unu na-eme nʼebe a unu nọdụrụ ala?
Kwakọtaanụ ihe unu niile.
Ngwa, ka anyị gbapụnụ ọsọ gaa nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike
nọdụ nʼebe ahụ nwụọ!
Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke anyị amaala anyị ikpe ọnwụ.
O nyela anyị mmiri e tinyere nsi ka anyị ṅụọ,
nʼihi na anyị emehiela megide ya. 15Anyị lere anya udo,
ma o nweghị ihe ọma ọbụla anyị hụrụ.
Anyị lere anya ọgwụgwọ ọrịa anyị,
maọbụ naanị ihe egwu ka anyị hụrụ. 16E sitere na Dan
nụ ụda ịma imi ịnyịnya ndị iro.
Ala a niile mara jijiji
mgbe ha nụrụ akwa nke ịnyịnya ndị ahụ dị ike.
Ha na-abịa ịla ala a na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi.
Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha
na-abịa ime obodo a na ndị bi nʼime ya. 17“Lee, ana m ezibata agwọ ọjọọ, ndị na-atagbu atagbu, nʼetiti unu.
Ajụala nke ọ dịkwaghị ụra ga-arata ha.*
Ana m ezibata ha ka ha taa unu.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 18Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na m hụrụ onye ga-akasị m obi nʼime ọnọdụ iru ụjụ m,
nʼihi na obi m na-ada mba nʼime m.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.