Jeremaya 51:55
Jeremiah 51:55 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị ga-ala Babilọn nʼiyi. Ọ ga-emekwa ka oke ụzụ ha kwụsị. Mbigbọ nke ndị iro ga-adịkwa ka mbigbọ nke ọtụtụ mmiri, mkpọtụ nke olu ha ga-ada ụda dị ukwuu.
Jeremiah 51:55 in English
Jeremiah 51:55 · Berean Standard Bible
For the LORD will destroy Babylon; He will silence her mighty voice. The waves will roar like great waters; the tumult of their voices will resound.
Context
53A sịkwarị* na Babilọn a arịgoruo nʼeluigwe,
ma a sịkwa na o wusie ebe dị elu nke ike ya mee ka o siwanyekwuo ike karịa,
aga m ezite ndị mbibi ga-abịa megide ya.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 54“Ụzụ ịkwa akwa si na Babilọn na-apụta,
ụzụ oke ịla nʼiyi
sikwa nʼala ndị Babilọn na-apụta. 55Onyenwe anyị ga-ala Babilọn nʼiyi.
Ọ ga-emekwa ka oke ụzụ ha kwụsị.
Mbigbọ nke ndị iro ga-adịkwa ka mbigbọ nke ọtụtụ mmiri,
mkpọtụ nke olu ha ga-ada ụda dị ukwuu. 56Onye mbibi ga-ebuso Babilọn agha.
A ga-adọta ndị bụ dike ya nʼagha,
gbajisiekwa ụta ha niile.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke onye na-akwụghachi;
ọ ga-akwụghachikwa nʼuju ya. 57Aga m eme ka ndịisi ọchịchị ya niile, na ndị maara ihe ha ṅụbiga mmanya oke;
aga m emekwa ndị ha na-achị achị, na ndịisi ha, na ndị ha bụ dike nʼagha otu ihe ahụ.
Ha ga-arahụ ụra ruo mgbe ebighị ebi. Ha agaghị esitekwa nʼụra ahụ bilie ọzọ.”
Ọ bụ ihe Eze ahụ kwubiri, bụ onye ahụ aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.