Jeremaya 51:53
Jeremiah 51:53 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A sịkwarị* na Babilọn a arịgoruo nʼeluigwe, ma a sịkwa na o wusie ebe dị elu nke ike ya mee ka o siwanyekwuo ike karịa, aga m ezite ndị mbibi ga-abịa megide ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Jeremiah 51:53 in English
Jeremiah 51:53 · Berean Standard Bible
Even if Babylon ascends to the heavens and fortifies her lofty stronghold, the destroyers I send will come against her,” declares the LORD.
Context
51“Ihere emeela anyị,
nʼihi na a kparịala anyị.
Ihere ekpuchiekwala ihu anyị,
nʼihi na ndị mba ọzọ abatala
nʼebe nsọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị.” 52“Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“mgbe m ga-ata arụsị ya niile ahụhụ.
Ndị e merụrụ ahụ
ga-asụkwa ude nʼala ahụ niile. 53A sịkwarị* na Babilọn a arịgoruo nʼeluigwe,
ma a sịkwa na o wusie ebe dị elu nke ike ya mee ka o siwanyekwuo ike karịa,
aga m ezite ndị mbibi ga-abịa megide ya.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 54“Ụzụ ịkwa akwa si na Babilọn na-apụta,
ụzụ oke ịla nʼiyi
sikwa nʼala ndị Babilọn na-apụta. 55Onyenwe anyị ga-ala Babilọn nʼiyi.
Ọ ga-emekwa ka oke ụzụ ha kwụsị.
Mbigbọ nke ndị iro ga-adịkwa ka mbigbọ nke ọtụtụ mmiri,
mkpọtụ nke olu ha ga-ada ụda dị ukwuu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.