Native Bible

Jeremiah 51:52 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata arụsị ya niile ahụhụ. Ndị e merụrụ ahụ ga-asụkwa ude nʼala ahụ niile.

Jeremiah 51:52 in English

Jeremiah 51:52 · Berean Standard Bible

“Therefore, behold, the days are coming,” declares the LORD, “when I will punish her idols, and throughout her land the wounded will groan.

Context

50Unu ndị siterela nʼihu mma agha gbapụ ọsọ, wezuganụ onwe unu, unu eguzokwala. Chetanụ Onyenwe anyị nʼala ahụ dị anya, na-echetakwa Jerusalem.” 51“Ihere emeela anyị, nʼihi na a kparịala anyị. Ihere ekpuchiekwala ihu anyị, nʼihi na ndị mba ọzọ abatala nʼebe nsọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị.” 52“Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata arụsị ya niile ahụhụ. Ndị e merụrụ ahụ ga-asụkwa ude nʼala ahụ niile. 53A sịkwarị* na Babilọn a arịgoruo nʼeluigwe, ma a sịkwa na o wusie ebe dị elu nke ike ya mee ka o siwanyekwuo ike karịa, aga m ezite ndị mbibi ga-abịa megide ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 54“Ụzụ ịkwa akwa si na Babilọn na-apụta, ụzụ oke ịla nʼiyi sikwa nʼala ndị Babilọn na-apụta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.