Jeremaya 51:54
Jeremiah 51:54 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ụzụ ịkwa akwa si na Babilọn na-apụta, ụzụ oke ịla nʼiyi sikwa nʼala ndị Babilọn na-apụta.
Jeremiah 51:54 in English
Jeremiah 51:54 · Berean Standard Bible
“The sound of a cry comes from Babylon, the sound of great destruction from the land of the Chaldeans!
Context
52“Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“mgbe m ga-ata arụsị ya niile ahụhụ.
Ndị e merụrụ ahụ
ga-asụkwa ude nʼala ahụ niile. 53A sịkwarị* na Babilọn a arịgoruo nʼeluigwe,
ma a sịkwa na o wusie ebe dị elu nke ike ya mee ka o siwanyekwuo ike karịa,
aga m ezite ndị mbibi ga-abịa megide ya.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 54“Ụzụ ịkwa akwa si na Babilọn na-apụta,
ụzụ oke ịla nʼiyi
sikwa nʼala ndị Babilọn na-apụta. 55Onyenwe anyị ga-ala Babilọn nʼiyi.
Ọ ga-emekwa ka oke ụzụ ha kwụsị.
Mbigbọ nke ndị iro ga-adịkwa ka mbigbọ nke ọtụtụ mmiri,
mkpọtụ nke olu ha ga-ada ụda dị ukwuu. 56Onye mbibi ga-ebuso Babilọn agha.
A ga-adọta ndị bụ dike ya nʼagha,
gbajisiekwa ụta ha niile.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke onye na-akwụghachi;
ọ ga-akwụghachikwa nʼuju ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.