Native Bible

Jeremiah 51:50 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu ndị siterela nʼihu mma agha gbapụ ọsọ, wezuganụ onwe unu, unu eguzokwala. Chetanụ Onyenwe anyị nʼala ahụ dị anya, na-echetakwa Jerusalem.”

Jeremiah 51:50 in English

Jeremiah 51:50 · Berean Standard Bible

You who have escaped the sword, depart and do not linger! Remember the LORD from far away, and let Jerusalem come to mind.”

Context

48mgbe ahụ, eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha ga-eti mkpu ọṅụ nʼihi ihe dakwasịrị Babilọn. Ndị ga-ebuso ya agha ga-esitekwa nʼugwu bịa.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 49“Babilọn ga-ada nʼihi ndị Izrel e gburu, dịka ndị niile e gburu nʼụwa si daa site nʼaka ndị Babilọn. 50Unu ndị siterela nʼihu mma agha gbapụ ọsọ, wezuganụ onwe unu, unu eguzokwala. Chetanụ Onyenwe anyị nʼala ahụ dị anya, na-echetakwa Jerusalem.” 51“Ihere emeela anyị, nʼihi na a kparịala anyị. Ihere ekpuchiekwala ihu anyị, nʼihi na ndị mba ọzọ abatala nʼebe nsọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị.” 52“Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata arụsị ya niile ahụhụ. Ndị e merụrụ ahụ ga-asụkwa ude nʼala ahụ niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.