Jeremaya 51:50
Jeremiah 51:50 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ndị siterela nʼihu mma agha gbapụ ọsọ, wezuganụ onwe unu, unu eguzokwala. Chetanụ Onyenwe anyị nʼala ahụ dị anya, na-echetakwa Jerusalem.”
Jeremiah 51:50 in English
Jeremiah 51:50 · Berean Standard Bible
You who have escaped the sword, depart and do not linger! Remember the LORD from far away, and let Jerusalem come to mind.”
Context
48mgbe ahụ, eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha
ga-eti mkpu ọṅụ nʼihi ihe dakwasịrị Babilọn.
Ndị ga-ebuso ya agha
ga-esitekwa nʼugwu bịa.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 49“Babilọn ga-ada nʼihi ndị Izrel e gburu,
dịka ndị niile e gburu nʼụwa
si daa site nʼaka ndị Babilọn. 50Unu ndị siterela nʼihu mma agha gbapụ ọsọ,
wezuganụ onwe unu, unu eguzokwala.
Chetanụ Onyenwe anyị nʼala ahụ dị anya,
na-echetakwa Jerusalem.” 51“Ihere emeela anyị,
nʼihi na a kparịala anyị.
Ihere ekpuchiekwala ihu anyị,
nʼihi na ndị mba ọzọ abatala
nʼebe nsọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị.” 52“Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“mgbe m ga-ata arụsị ya niile ahụhụ.
Ndị e merụrụ ahụ
ga-asụkwa ude nʼala ahụ niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.