Jeremaya 51:49
Jeremiah 51:49 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Babilọn ga-ada nʼihi ndị Izrel e gburu, dịka ndị niile e gburu nʼụwa si daa site nʼaka ndị Babilọn.
Jeremiah 51:49 in English
Jeremiah 51:49 · Berean Standard Bible
“Babylon must fall on account of the slain of Israel, just as the slain of all the earth have fallen because of Babylon.
Context
47Nʼihi na oge ahụ aghaghị ịbịa
mgbe m ga-ata arụsị niile dị na Babilọn ahụhụ.
A ga-eme ka ihere mee ala ahụ niile.
Ndị ya niile e gburu egbu ga-ada, tọgbọrọkwa nʼime ya, 48mgbe ahụ, eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha
ga-eti mkpu ọṅụ nʼihi ihe dakwasịrị Babilọn.
Ndị ga-ebuso ya agha
ga-esitekwa nʼugwu bịa.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 49“Babilọn ga-ada nʼihi ndị Izrel e gburu,
dịka ndị niile e gburu nʼụwa
si daa site nʼaka ndị Babilọn. 50Unu ndị siterela nʼihu mma agha gbapụ ọsọ,
wezuganụ onwe unu, unu eguzokwala.
Chetanụ Onyenwe anyị nʼala ahụ dị anya,
na-echetakwa Jerusalem.” 51“Ihere emeela anyị,
nʼihi na a kparịala anyị.
Ihere ekpuchiekwala ihu anyị,
nʼihi na ndị mba ọzọ abatala
nʼebe nsọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.