Jeremaya 51:47
Jeremiah 51:47 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na oge ahụ aghaghị ịbịa mgbe m ga-ata arụsị niile dị na Babilọn ahụhụ. A ga-eme ka ihere mee ala ahụ niile. Ndị ya niile e gburu egbu ga-ada, tọgbọrọkwa nʼime ya,
Jeremiah 51:47 in English
Jeremiah 51:47 · Berean Standard Bible
Therefore, behold, the days are coming when I will punish the idols of Babylon. Her entire land will suffer shame, and all her slain will lie fallen within her.
Context
45“Sinụ nʼime ya pụta, unu ndị m!
Gbapụnụ ọsọ nʼihi ndụ unu.
Gbapụnụ ọsọ site nʼiwe dị ọkụ nke Onyenwe anyị. 46Unu adala mba, unu atụkwala ụjọ,
mgbe unu nụrụ akụkọ dị iche iche nʼala ahụ.
Nʼihi na otu ụdị akụkọ ka a ga-anụ nʼafọ a, akụkọ ọzọ dị iche ka a ga-anụkwa nʼafọ nke ọzọ.
A ga-anụ akụkọ iwusi ọbara nʼala ahụ,
nụkwa akụkọ onye ọchịchị nke na-ebuso onye ọchịchị ọzọ agha. 47Nʼihi na oge ahụ aghaghị ịbịa
mgbe m ga-ata arụsị niile dị na Babilọn ahụhụ.
A ga-eme ka ihere mee ala ahụ niile.
Ndị ya niile e gburu egbu ga-ada, tọgbọrọkwa nʼime ya, 48mgbe ahụ, eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha
ga-eti mkpu ọṅụ nʼihi ihe dakwasịrị Babilọn.
Ndị ga-ebuso ya agha
ga-esitekwa nʼugwu bịa.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 49“Babilọn ga-ada nʼihi ndị Izrel e gburu,
dịka ndị niile e gburu nʼụwa
si daa site nʼaka ndị Babilọn.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.