Jeremaya 51:57
Jeremiah 51:57 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eme ka ndịisi ọchịchị ya niile, na ndị maara ihe ha ṅụbiga mmanya oke; aga m emekwa ndị ha na-achị achị, na ndịisi ha, na ndị ha bụ dike nʼagha otu ihe ahụ. Ha ga-arahụ ụra ruo mgbe ebighị ebi. Ha agaghị esitekwa nʼụra ahụ bilie ọzọ.” Ọ bụ ihe Eze ahụ kwubiri, bụ onye ahụ aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Jeremiah 51:57 in English
Jeremiah 51:57 · Berean Standard Bible
I will make her princes and wise men drunk, along with her governors, officials, and warriors. Then they will fall asleep forever and not wake up,” declares the King, whose name is the LORD of Hosts.
Context
55Onyenwe anyị ga-ala Babilọn nʼiyi.
Ọ ga-emekwa ka oke ụzụ ha kwụsị.
Mbigbọ nke ndị iro ga-adịkwa ka mbigbọ nke ọtụtụ mmiri,
mkpọtụ nke olu ha ga-ada ụda dị ukwuu. 56Onye mbibi ga-ebuso Babilọn agha.
A ga-adọta ndị bụ dike ya nʼagha,
gbajisiekwa ụta ha niile.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke onye na-akwụghachi;
ọ ga-akwụghachikwa nʼuju ya. 57Aga m eme ka ndịisi ọchịchị ya niile, na ndị maara ihe ha ṅụbiga mmanya oke;
aga m emekwa ndị ha na-achị achị, na ndịisi ha, na ndị ha bụ dike nʼagha otu ihe ahụ.
Ha ga-arahụ ụra ruo mgbe ebighị ebi. Ha agaghị esitekwa nʼụra ahụ bilie ọzọ.”
Ọ bụ ihe Eze ahụ kwubiri, bụ onye ahụ aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 58Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“A ga-akwada mgbidi Babilọn nke sara mbara, mee ka ọ daruo ala,
a ga-eji ọkụ sunye nʼọnụ ụzọ ama ya niile dị elu.
Ndị dị iche iche na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu.
Ndọgbu nʼọrụ nke mba niile dị iche iche ga-abụ nkụ a na-akwanye nʼọkụ.” 59Ndị a bụ ozi Jeremaya, bụ onye amụma ziri onyeisi ozi aha ya bụ Seraya nwa Neraya, nwa Mahseia, mgbe o so Zedekaya eze Juda gaa Babilọn. E ziri ya ozi a nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Zedekaya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.