Jeremaya 51:58
Jeremiah 51:58 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “A ga-akwada mgbidi Babilọn nke sara mbara, mee ka ọ daruo ala, a ga-eji ọkụ sunye nʼọnụ ụzọ ama ya niile dị elu. Ndị dị iche iche na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ndọgbu nʼọrụ nke mba niile dị iche iche ga-abụ nkụ a na-akwanye nʼọkụ.”
Jeremiah 51:58 in English
Jeremiah 51:58 · Berean Standard Bible
This is what the LORD of Hosts says: “Babylon’s thick walls will be leveled, and her high gates consumed by fire. So the labor of the people will be for nothing; the nations will exhaust themselves to fuel the flames.”
Context
56Onye mbibi ga-ebuso Babilọn agha.
A ga-adọta ndị bụ dike ya nʼagha,
gbajisiekwa ụta ha niile.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke onye na-akwụghachi;
ọ ga-akwụghachikwa nʼuju ya. 57Aga m eme ka ndịisi ọchịchị ya niile, na ndị maara ihe ha ṅụbiga mmanya oke;
aga m emekwa ndị ha na-achị achị, na ndịisi ha, na ndị ha bụ dike nʼagha otu ihe ahụ.
Ha ga-arahụ ụra ruo mgbe ebighị ebi. Ha agaghị esitekwa nʼụra ahụ bilie ọzọ.”
Ọ bụ ihe Eze ahụ kwubiri, bụ onye ahụ aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 58Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“A ga-akwada mgbidi Babilọn nke sara mbara, mee ka ọ daruo ala,
a ga-eji ọkụ sunye nʼọnụ ụzọ ama ya niile dị elu.
Ndị dị iche iche na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu.
Ndọgbu nʼọrụ nke mba niile dị iche iche ga-abụ nkụ a na-akwanye nʼọkụ.” 59Ndị a bụ ozi Jeremaya, bụ onye amụma ziri onyeisi ozi aha ya bụ Seraya nwa Neraya, nwa Mahseia, mgbe o so Zedekaya eze Juda gaa Babilọn. E ziri ya ozi a nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Zedekaya. 60Jeremaya depụtara nʼakwụkwọ ihe banyere ihe ọjọọ ndị ahụ niile ga-abịakwasị Babilọn, ya bụ ihe niile e dere banyere Babilọn.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.