Native Bible

Jeremiah 51:60 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jeremaya depụtara nʼakwụkwọ ihe banyere ihe ọjọọ ndị ahụ niile ga-abịakwasị Babilọn, ya bụ ihe niile e dere banyere Babilọn.

Jeremiah 51:60 in English

Jeremiah 51:60 · Berean Standard Bible

Jeremiah had written on a single scroll about all the disaster that would come upon Babylon—all these words that had been written concerning Babylon.

Context

58Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “A ga-akwada mgbidi Babilọn nke sara mbara, mee ka ọ daruo ala, a ga-eji ọkụ sunye nʼọnụ ụzọ ama ya niile dị elu. Ndị dị iche iche na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ndọgbu nʼọrụ nke mba niile dị iche iche ga-abụ nkụ a na-akwanye nʼọkụ.” 59Ndị a bụ ozi Jeremaya, bụ onye amụma ziri onyeisi ozi aha ya bụ Seraya nwa Neraya, nwa Mahseia, mgbe o so Zedekaya eze Juda gaa Babilọn. E ziri ya ozi a nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Zedekaya. 60Jeremaya depụtara nʼakwụkwọ ihe banyere ihe ọjọọ ndị ahụ niile ga-abịakwasị Babilọn, ya bụ ihe niile e dere banyere Babilọn. 61Ọ sịrị Seraya, “Mgbe i ruru Babilọn, lezie anya hụ na ị gụpụtara okwu ndị a niile ebe ndị mmadụ ga-anụ ya. 62Emesịa, ị ga-ekwukwa sị, ‘Onyenwe anyị, gị onwe gị ekwuola na i ga-ebibi ebe a, ma mmadụ maọbụ anụmanụ agaghị ebikwa nʼime ya. I kwuokwala na ọ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.