Jeremaya 51:62
Jeremiah 51:62 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, ị ga-ekwukwa sị, ‘Onyenwe anyị, gị onwe gị ekwuola na i ga-ebibi ebe a, ma mmadụ maọbụ anụmanụ agaghị ebikwa nʼime ya. I kwuokwala na ọ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.’
Jeremiah 51:62 in English
Jeremiah 51:62 · Berean Standard Bible
and say, ‘O LORD, You have promised to cut off this place so that no one will remain—neither man nor beast. Indeed, it will be desolate forever.’
Context
60Jeremaya depụtara nʼakwụkwọ ihe banyere ihe ọjọọ ndị ahụ niile ga-abịakwasị Babilọn, ya bụ ihe niile e dere banyere Babilọn. 61Ọ sịrị Seraya, “Mgbe i ruru Babilọn, lezie anya hụ na ị gụpụtara okwu ndị a niile ebe ndị mmadụ ga-anụ ya. 62Emesịa, ị ga-ekwukwa sị, ‘Onyenwe anyị, gị onwe gị ekwuola na i ga-ebibi ebe a, ma mmadụ maọbụ anụmanụ agaghị ebikwa nʼime ya. I kwuokwala na ọ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.’ 63Mgbe ị gụsịrị ihe dị nʼakwụkwọ a, kegide ya nkume, tụnye ya nʼetiti iyi ukwu Yufretis. 64Ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka Babilọn ga-esi mikpuo. Ọ gaghị ebilikwa ọzọ, nʼihi ihe ọjọọ ahụ m ga-eme ka ọ bịakwasị ya. Ndị ya ga-adakwa.’ ”
Ebe a ka okwu Jeremaya niile gwụrụ.
51:53 Maọbụ, asịgodu
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.