Native Bible

Jeremiah 51:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha ga-ada, bụrụ ndị e gburu egbu nʼime Babilọn, ha ga-abụ ndị e merụrụ oke ahụ nʼokporoụzọ niile.

Jeremiah 51:4 in English

Jeremiah 51:4 · Berean Standard Bible

And they will fall slain in the land of the Chaldeans,* and pierced through in her streets.

Context

2Aga m eziga ndị mba ọzọ nʼobodo Babilọn, ka ha gaa fụchaa ya, bibiekwa ala ya. Ha ga-emegide ya nʼakụkụ niile, nʼụbọchị ahụ ihe ọjọọ ga-abịakwasị ya. 3Ekwela ka onye na-agba ụta kwee ụta ya, ekwekwala ka o yikwasị uwe agha ya. Enwekwala ọmịiko nʼebe ụmụ okorobịa ya nọ, kama bibie usuu ndị agha ya kpamkpam. 4Ha ga-ada, bụrụ ndị e gburu egbu nʼime Babilọn, ha ga-abụ ndị e merụrụ oke ahụ nʼokporoụzọ niile. 5Ọ bụ ezie nʼala ha jupụtara nʼikpe ọmụma, nʼihu Onye nsọ nke Izrel, ma Chineke bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile agbakụtabeghị ndị Izrel na Juda azụ. 6“Sinụ na Babilọn gbapụ ọsọ. Gbasienụ ọsọ ike nʼihi ndụ unu. Unu ekwela ka e bibie unu nʼihi mmehie ya. Oge ịbọ ọbọ Onyenwe anyị eruola, ọ ga-akwụghachi ya ihe ruuru ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.