Native Bible

Jeremiah 51:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ ezie nʼala ha jupụtara nʼikpe ọmụma, nʼihu Onye nsọ nke Izrel, ma Chineke bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile agbakụtabeghị ndị Izrel na Juda azụ.

Jeremiah 51:5 in English

Jeremiah 51:5 · Berean Standard Bible

For Israel and Judah have not been abandoned by their God, the LORD of Hosts, though their land is full of guilt before the Holy One of Israel.”

Context

3Ekwela ka onye na-agba ụta kwee ụta ya, ekwekwala ka o yikwasị uwe agha ya. Enwekwala ọmịiko nʼebe ụmụ okorobịa ya nọ, kama bibie usuu ndị agha ya kpamkpam. 4Ha ga-ada, bụrụ ndị e gburu egbu nʼime Babilọn, ha ga-abụ ndị e merụrụ oke ahụ nʼokporoụzọ niile. 5Ọ bụ ezie nʼala ha jupụtara nʼikpe ọmụma, nʼihu Onye nsọ nke Izrel, ma Chineke bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile agbakụtabeghị ndị Izrel na Juda azụ. 6“Sinụ na Babilọn gbapụ ọsọ. Gbasienụ ọsọ ike nʼihi ndụ unu. Unu ekwela ka e bibie unu nʼihi mmehie ya. Oge ịbọ ọbọ Onyenwe anyị eruola, ọ ga-akwụghachi ya ihe ruuru ya. 7Babilọn dị ka iko ọlaedo nʼaka Onyenwe anyị. O mere ka ụwa niile si nʼiko ahụ ṅụbiga ihe ọṅụṅụ oke. Mba niile nke ụwa ṅụrụ mmanya ya. Ugbu a ha niile na-ayị ara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.