Jeremaya 51:3
Jeremiah 51:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ekwela ka onye na-agba ụta kwee ụta ya, ekwekwala ka o yikwasị uwe agha ya. Enwekwala ọmịiko nʼebe ụmụ okorobịa ya nọ, kama bibie usuu ndị agha ya kpamkpam.
Jeremiah 51:3 in English
Jeremiah 51:3 · Berean Standard Bible
Do not let the archer bend his bow or put on his armor. Do not spare her young men; devote all her army to destruction!*
Context
1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Lee, aga m akpali mmụọ onye mbibi,
ka ọ bịa megide Babilọn na ndị bi na Kaldịa. 2Aga m eziga ndị mba ọzọ nʼobodo Babilọn,
ka ha gaa fụchaa ya, bibiekwa ala ya.
Ha ga-emegide ya nʼakụkụ niile,
nʼụbọchị ahụ ihe ọjọọ ga-abịakwasị ya. 3Ekwela ka onye na-agba ụta kwee ụta ya,
ekwekwala ka o yikwasị uwe agha ya.
Enwekwala ọmịiko nʼebe ụmụ okorobịa ya nọ,
kama bibie usuu ndị agha ya kpamkpam. 4Ha ga-ada, bụrụ ndị e gburu egbu nʼime Babilọn,
ha ga-abụ ndị e merụrụ oke ahụ nʼokporoụzọ niile. 5Ọ bụ ezie nʼala ha jupụtara nʼikpe ọmụma,
nʼihu Onye nsọ nke Izrel,
ma Chineke bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
agbakụtabeghị ndị Izrel na Juda azụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.