Jeremaya 51:2
Jeremiah 51:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eziga ndị mba ọzọ nʼobodo Babilọn, ka ha gaa fụchaa ya, bibiekwa ala ya. Ha ga-emegide ya nʼakụkụ niile, nʼụbọchị ahụ ihe ọjọọ ga-abịakwasị ya.
Jeremiah 51:2 in English
Jeremiah 51:2 · Berean Standard Bible
I will send strangers to Babylon to winnow her and empty her land; for they will come against her from every side in her day of disaster.
Context
1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Lee, aga m akpali mmụọ onye mbibi,
ka ọ bịa megide Babilọn na ndị bi na Kaldịa. 2Aga m eziga ndị mba ọzọ nʼobodo Babilọn,
ka ha gaa fụchaa ya, bibiekwa ala ya.
Ha ga-emegide ya nʼakụkụ niile,
nʼụbọchị ahụ ihe ọjọọ ga-abịakwasị ya. 3Ekwela ka onye na-agba ụta kwee ụta ya,
ekwekwala ka o yikwasị uwe agha ya.
Enwekwala ọmịiko nʼebe ụmụ okorobịa ya nọ,
kama bibie usuu ndị agha ya kpamkpam. 4Ha ga-ada, bụrụ ndị e gburu egbu nʼime Babilọn,
ha ga-abụ ndị e merụrụ oke ahụ nʼokporoụzọ niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.