Jeremaya 5:20
Jeremiah 5:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Kwupụta ihe a ka ụlọ Jekọb nụrụ ya, kwusaa ya na Juda.
Jeremiah 5:20 in English
Jeremiah 5:20 · Berean Standard Bible
Declare this in the house of Jacob and proclaim it in Judah:
Context
18“Ma ọ bụladị na nʼụbọchị ndị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Agaghị m ebibicha unu kpamkpam. 19Ọ ga-erukwa, mgbe ndị mmadụ ga-ajụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị Chineke anyị ji mee anyị ihe dị otu a?’ Unu ga-agwa ha sị, ‘Dịka unu si gbakụta ya azụ malite ife chi ndị mba ọzọ nʼala nke aka unu, otu a ka unu ga-esi kpọọ isiala nye ndị mba ọzọ nʼala na-abụghị nke unu.’ 20“Kwupụta ihe a ka ụlọ Jekọb nụrụ ya,
kwusaa ya na Juda. 21Nụrụnụ ihe ndị a, unu ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche,
unu ndị nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ,
na unu ndị nwere ntị nke na-adịghị anụ ihe. 22Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ sị,
o kwesighị ka unu tụọ m egwu?”
“O kwesighị ka unu maa jijiji nʼihu m?
Emeela m ka uzuzu bụrụ oke osimiri nwere.
Ọ bụkwa ụkpụrụ ebighị ebi nke ọ na-enweghị ike ịgafe.
Ebili mmiri nwere ike magharịa, ma nke a apụghị ime ka osimiri si nʼọnọdụ ya wezuga onwe ya.
Osimiri nwere ike bigbọọ, ma ọ pụghị ịgafe oke ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.