Jeremaya 5:19
Jeremiah 5:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-erukwa, mgbe ndị mmadụ ga-ajụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị Chineke anyị ji mee anyị ihe dị otu a?’ Unu ga-agwa ha sị, ‘Dịka unu si gbakụta ya azụ malite ife chi ndị mba ọzọ nʼala nke aka unu, otu a ka unu ga-esi kpọọ isiala nye ndị mba ọzọ nʼala na-abụghị nke unu.’
Jeremiah 5:19 in English
Jeremiah 5:19 · Berean Standard Bible
And when the people ask, ‘For what offense has the LORD our God done all these things to us?’ You are to tell them, ‘Just as you have forsaken Me and served foreign gods in your land, so will you serve foreigners in a land that is not your own.’”
Context
17Ha ga-eripịa ihe niile unu wetara nʼubi, ya na nri niile unu nwere.
Ha ga-ebibi ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị.
Ha ga-ebibi igwe ewu na atụrụ unu, na igwe ehi unu.
Ha ga-ebibikwa osisi vaịnị na osisi fiig unu.
Ọ bụ mma agha ha ka ha ga-eji bibie obodo unu niile e wusiri ike,
bụ obodo ndị ahụ niile unu na-atụkwasị uche. 18“Ma ọ bụladị na nʼụbọchị ndị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Agaghị m ebibicha unu kpamkpam. 19Ọ ga-erukwa, mgbe ndị mmadụ ga-ajụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị Chineke anyị ji mee anyị ihe dị otu a?’ Unu ga-agwa ha sị, ‘Dịka unu si gbakụta ya azụ malite ife chi ndị mba ọzọ nʼala nke aka unu, otu a ka unu ga-esi kpọọ isiala nye ndị mba ọzọ nʼala na-abụghị nke unu.’ 20“Kwupụta ihe a ka ụlọ Jekọb nụrụ ya,
kwusaa ya na Juda. 21Nụrụnụ ihe ndị a, unu ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche,
unu ndị nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ,
na unu ndị nwere ntị nke na-adịghị anụ ihe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.