Native Bible

Jeremiah 5:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma ọ bụladị na nʼụbọchị ndị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Agaghị m ebibicha unu kpamkpam.

Jeremiah 5:18 in English

Jeremiah 5:18 · Berean Standard Bible

“Yet even in those days,” declares the LORD, “I will not make a full end of you.

Context

16Akpa àkụ ha dịka ili ghere oghe; ha niile bụkwa ndị dike nʼagha. 17Ha ga-eripịa ihe niile unu wetara nʼubi, ya na nri niile unu nwere. Ha ga-ebibi ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị. Ha ga-ebibi igwe ewu na atụrụ unu, na igwe ehi unu. Ha ga-ebibikwa osisi vaịnị na osisi fiig unu. Ọ bụ mma agha ha ka ha ga-eji bibie obodo unu niile e wusiri ike, bụ obodo ndị ahụ niile unu na-atụkwasị uche. 18“Ma ọ bụladị na nʼụbọchị ndị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Agaghị m ebibicha unu kpamkpam. 19Ọ ga-erukwa, mgbe ndị mmadụ ga-ajụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị Chineke anyị ji mee anyị ihe dị otu a?’ Unu ga-agwa ha sị, ‘Dịka unu si gbakụta ya azụ malite ife chi ndị mba ọzọ nʼala nke aka unu, otu a ka unu ga-esi kpọọ isiala nye ndị mba ọzọ nʼala na-abụghị nke unu.’ 20“Kwupụta ihe a ka ụlọ Jekọb nụrụ ya, kwusaa ya na Juda.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.