Jeremaya 48:43
Jeremiah 48:43 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Oke egwu na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya nọ na-eche unu, unu ndị Moab,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Jeremiah 48:43 in English
Jeremiah 48:43 · Berean Standard Bible
Terror and pit and snare await you, O dweller of Moab,” declares the LORD.
Context
41A ga-adọta Keriọt nʼagha,
meriekwa ebe ya niile e wusiri ike.
Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bụ dike nʼagha nʼala Moab
ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme. 42A ga-ebibi obodo Moab, mee ya ka ọ ghara ịdịkwa,
nʼihi na ọ kagidere Onyenwe anyị anya. 43Oke egwu na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya nọ na-eche unu,
unu ndị Moab,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 44“Nʼoge ahụ, onye ọbụla gbapụrụ ọsọ site nʼihe oke egwu
ga-adaba nʼolulu.
Onye ọbụla ga-esikwa nʼolulu rịpụta
ka igbudu ga-ejide.
Nʼihi na aga m eme ka afọ ahụ a kara aka
maka ịta Moab ahụhụ bịakwasị ya,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 45“Nʼokpuru ndo Heshbọn
ka ndị ahụ gbapụrụ ọsọ ndụ guzoro, na-enweghị onye inyeaka.
Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn rere na-aga;
ire ọkụ dị ukwuu esitela nʼetiti Saịhọn na-apụ,
na-erepịa egedege ihu ndị Moab,
na okpokoro* isi ndị ahụ ji oke ụzụ* na-anya isi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.