Jeremaya 48:45
Jeremiah 48:45 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼokpuru ndo Heshbọn ka ndị ahụ gbapụrụ ọsọ ndụ guzoro, na-enweghị onye inyeaka. Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn rere na-aga; ire ọkụ dị ukwuu esitela nʼetiti Saịhọn na-apụ, na-erepịa egedege ihu ndị Moab, na okpokoro* isi ndị ahụ ji oke ụzụ* na-anya isi.
Jeremiah 48:45 in English
Jeremiah 48:45 · Berean Standard Bible
“Those who flee will stand helpless in Heshbon’s shadow, because fire has gone forth from Heshbon and a flame from within Sihon. It devours the foreheads of Moab and the skulls of the sons of tumult.
Context
43Oke egwu na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya nọ na-eche unu,
unu ndị Moab,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 44“Nʼoge ahụ, onye ọbụla gbapụrụ ọsọ site nʼihe oke egwu
ga-adaba nʼolulu.
Onye ọbụla ga-esikwa nʼolulu rịpụta
ka igbudu ga-ejide.
Nʼihi na aga m eme ka afọ ahụ a kara aka
maka ịta Moab ahụhụ bịakwasị ya,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 45“Nʼokpuru ndo Heshbọn
ka ndị ahụ gbapụrụ ọsọ ndụ guzoro, na-enweghị onye inyeaka.
Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn rere na-aga;
ire ọkụ dị ukwuu esitela nʼetiti Saịhọn na-apụ,
na-erepịa egedege ihu ndị Moab,
na okpokoro* isi ndị ahụ ji oke ụzụ* na-anya isi. 46Ahụhụ dịrị gị, gị Moab!
Ebibiela ndị Kemosh niile.
A dọtakwala ụmụ gị ndị ikom
na ụmụ gị ndị inyom nʼagha, buru ha gaa mba ọzọ. 47“Ma emesịa, nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa,
aga m eme ka ndị Moab a dọtara nʼagha lọghachi.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Nke a bụ ọgwụgwụ ikpe ọmụma dịrị Moab.
48:12 Ịwụgharị ihe site nʼotu ite wụbanye ya nʼọzọ
48:15 Ya bụ, nʼagha ahụ
48:17 Maọbụ, ruo ụjụ maka ya
48:19 Ya bụ, Lee
48:25 Ya bụ, ike
48:45 Maọbụ, opu isi
48:45 Maọbụ, mkpọtụ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.