Jeremaya 48:46
Jeremiah 48:46 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụhụ dịrị gị, gị Moab! Ebibiela ndị Kemosh niile. A dọtakwala ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom nʼagha, buru ha gaa mba ọzọ.
Jeremiah 48:46 in English
Jeremiah 48:46 · Berean Standard Bible
Woe to you, O Moab! The people of Chemosh have perished; for your sons have been taken into exile and your daughters have gone into captivity.
Context
44“Nʼoge ahụ, onye ọbụla gbapụrụ ọsọ site nʼihe oke egwu
ga-adaba nʼolulu.
Onye ọbụla ga-esikwa nʼolulu rịpụta
ka igbudu ga-ejide.
Nʼihi na aga m eme ka afọ ahụ a kara aka
maka ịta Moab ahụhụ bịakwasị ya,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 45“Nʼokpuru ndo Heshbọn
ka ndị ahụ gbapụrụ ọsọ ndụ guzoro, na-enweghị onye inyeaka.
Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn rere na-aga;
ire ọkụ dị ukwuu esitela nʼetiti Saịhọn na-apụ,
na-erepịa egedege ihu ndị Moab,
na okpokoro* isi ndị ahụ ji oke ụzụ* na-anya isi. 46Ahụhụ dịrị gị, gị Moab!
Ebibiela ndị Kemosh niile.
A dọtakwala ụmụ gị ndị ikom
na ụmụ gị ndị inyom nʼagha, buru ha gaa mba ọzọ. 47“Ma emesịa, nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa,
aga m eme ka ndị Moab a dọtara nʼagha lọghachi.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Nke a bụ ọgwụgwụ ikpe ọmụma dịrị Moab.
48:12 Ịwụgharị ihe site nʼotu ite wụbanye ya nʼọzọ
48:15 Ya bụ, nʼagha ahụ
48:17 Maọbụ, ruo ụjụ maka ya
48:19 Ya bụ, Lee
48:25 Ya bụ, ike
48:45 Maọbụ, opu isi
48:45 Maọbụ, mkpọtụ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.