Jeremaya 48:42
Jeremiah 48:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-ebibi obodo Moab, mee ya ka ọ ghara ịdịkwa, nʼihi na ọ kagidere Onyenwe anyị anya.
Jeremiah 48:42 in English
Jeremiah 48:42 · Berean Standard Bible
Moab will be destroyed as a nation because he vaunted himself against the LORD.
Context
40Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Lee, ọ dị otu ugo na-efedata,
nke gbasapụrụ nku ya kpuchie ala Moab niile. 41A ga-adọta Keriọt nʼagha,
meriekwa ebe ya niile e wusiri ike.
Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bụ dike nʼagha nʼala Moab
ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme. 42A ga-ebibi obodo Moab, mee ya ka ọ ghara ịdịkwa,
nʼihi na ọ kagidere Onyenwe anyị anya. 43Oke egwu na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya nọ na-eche unu,
unu ndị Moab,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 44“Nʼoge ahụ, onye ọbụla gbapụrụ ọsọ site nʼihe oke egwu
ga-adaba nʼolulu.
Onye ọbụla ga-esikwa nʼolulu rịpụta
ka igbudu ga-ejide.
Nʼihi na aga m eme ka afọ ahụ a kara aka
maka ịta Moab ahụhụ bịakwasị ya,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.