Jeremaya 48:40
Jeremiah 48:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, ọ dị otu ugo na-efedata, nke gbasapụrụ nku ya kpuchie ala Moab niile.
Jeremiah 48:40 in English
Jeremiah 48:40 · Berean Standard Bible
For this is what the LORD says: “Behold, an eagle swoops down and spreads his wings against Moab.
Context
38Nʼelu ụlọ niile nke dị na Moab,
nakwa nʼama egwuregwu niile,
ọ dịghị ihe ọzọ karịa naanị iru ụjụ ka a na-ahụ.
Nʼihi na e tiwaala m Moab
dịka e si etiwa ite aja nke ọ dịghị onye bụla chọrọ ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 39“Lee ka e si tipịa ya! Lee ka ha si akwasị akwa ike!
Leekwa ka Moab si gbakụta azụ ya nʼihi ọnọdụ ihere ya!
Moab aghọọla ihe ọchị,
ọ ghọọla ihe iju anya nye ndị niile gbara ya gburugburu.” 40Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Lee, ọ dị otu ugo na-efedata,
nke gbasapụrụ nku ya kpuchie ala Moab niile. 41A ga-adọta Keriọt nʼagha,
meriekwa ebe ya niile e wusiri ike.
Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bụ dike nʼagha nʼala Moab
ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme. 42A ga-ebibi obodo Moab, mee ya ka ọ ghara ịdịkwa,
nʼihi na ọ kagidere Onyenwe anyị anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.