Native Bible

Jeremiah 48:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, ọ dị otu ugo na-efedata, nke gbasapụrụ nku ya kpuchie ala Moab niile.

Jeremiah 48:40 in English

Jeremiah 48:40 · Berean Standard Bible

For this is what the LORD says: “Behold, an eagle swoops down and spreads his wings against Moab.

Context

38Nʼelu ụlọ niile nke dị na Moab, nakwa nʼama egwuregwu niile, ọ dịghị ihe ọzọ karịa naanị iru ụjụ ka a na-ahụ. Nʼihi na e tiwaala m Moab dịka e si etiwa ite aja nke ọ dịghị onye bụla chọrọ ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 39“Lee ka e si tipịa ya! Lee ka ha si akwasị akwa ike! Leekwa ka Moab si gbakụta azụ ya nʼihi ọnọdụ ihere ya! Moab aghọọla ihe ọchị, ọ ghọọla ihe iju anya nye ndị niile gbara ya gburugburu.” 40Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, ọ dị otu ugo na-efedata, nke gbasapụrụ nku ya kpuchie ala Moab niile. 41A ga-adọta Keriọt nʼagha, meriekwa ebe ya niile e wusiri ike. Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bụ dike nʼagha nʼala Moab ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme. 42A ga-ebibi obodo Moab, mee ya ka ọ ghara ịdịkwa, nʼihi na ọ kagidere Onyenwe anyị anya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.