Native Bible

Jeremiah 48:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼelu ụlọ niile nke dị na Moab, nakwa nʼama egwuregwu niile, ọ dịghị ihe ọzọ karịa naanị iru ụjụ ka a na-ahụ. Nʼihi na e tiwaala m Moab dịka e si etiwa ite aja nke ọ dịghị onye bụla chọrọ ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Jeremiah 48:38 in English

Jeremiah 48:38 · Berean Standard Bible

On all the rooftops of Moab and in the public squares, everyone is mourning; for I have shattered Moab like an unwanted jar,” declares the LORD.

Context

36“Ụda akwa nke na-ada nʼime obi m nʼihi Moab dịka ụda ọja. Ụda akwa nke dịkwa ka ụda ọja na-adakwa nʼime obi m nʼihi ndị Kia Hareset. Akụ niile ha kpakọtara alaala nʼiyi. 37A kpụchapụla agịrị isi niile, kpachakwa afụọnụ ha niile. E bipụkwala aka ha niile. Ọ bụkwa akwa mkpe ka e ji kpuchie ukwu niile. 38Nʼelu ụlọ niile nke dị na Moab, nakwa nʼama egwuregwu niile, ọ dịghị ihe ọzọ karịa naanị iru ụjụ ka a na-ahụ. Nʼihi na e tiwaala m Moab dịka e si etiwa ite aja nke ọ dịghị onye bụla chọrọ ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 39“Lee ka e si tipịa ya! Lee ka ha si akwasị akwa ike! Leekwa ka Moab si gbakụta azụ ya nʼihi ọnọdụ ihere ya! Moab aghọọla ihe ọchị, ọ ghọọla ihe iju anya nye ndị niile gbara ya gburugburu.” 40Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, ọ dị otu ugo na-efedata, nke gbasapụrụ nku ya kpuchie ala Moab niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.