Jeremaya 48:38
Jeremiah 48:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼelu ụlọ niile nke dị na Moab, nakwa nʼama egwuregwu niile, ọ dịghị ihe ọzọ karịa naanị iru ụjụ ka a na-ahụ. Nʼihi na e tiwaala m Moab dịka e si etiwa ite aja nke ọ dịghị onye bụla chọrọ ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Jeremiah 48:38 in English
Jeremiah 48:38 · Berean Standard Bible
On all the rooftops of Moab and in the public squares, everyone is mourning; for I have shattered Moab like an unwanted jar,” declares the LORD.
Context
36“Ụda akwa nke na-ada nʼime obi m nʼihi Moab dịka ụda ọja.
Ụda akwa nke dịkwa ka ụda ọja na-adakwa nʼime obi m nʼihi ndị Kia Hareset.
Akụ niile ha kpakọtara alaala nʼiyi. 37A kpụchapụla agịrị isi niile,
kpachakwa afụọnụ ha niile.
E bipụkwala aka ha niile.
Ọ bụkwa akwa mkpe ka e ji kpuchie ukwu niile. 38Nʼelu ụlọ niile nke dị na Moab,
nakwa nʼama egwuregwu niile,
ọ dịghị ihe ọzọ karịa naanị iru ụjụ ka a na-ahụ.
Nʼihi na e tiwaala m Moab
dịka e si etiwa ite aja nke ọ dịghị onye bụla chọrọ ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 39“Lee ka e si tipịa ya! Lee ka ha si akwasị akwa ike!
Leekwa ka Moab si gbakụta azụ ya nʼihi ọnọdụ ihere ya!
Moab aghọọla ihe ọchị,
ọ ghọọla ihe iju anya nye ndị niile gbara ya gburugburu.” 40Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Lee, ọ dị otu ugo na-efedata,
nke gbasapụrụ nku ya kpuchie ala Moab niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.